Joshua 2

Rehab na ndị Nnyopụta

1Joshua nwa Nun sitere na Shitim zipụ ndị nnyopụta abụọ na nzuzo sị ha, “Gaanụ leta otu ihe si aga nʼala ahụ, karịsịa nʼobodo Jeriko.”
Jeriko bụ obodo ochie e wuru nke ọma, wusikwaa ike. Obodo e ji mgbidi e wusiri ike gbaa gburugburu, nke ọtụtụ iyi, tinyekwara osimiri gbara gburugburu. Jos 15:1-6 E wuru ya ka o nwee ike ịnagide atụmatụ ọbụla nke ndị iro na-atụ, maka ịba nʼime ya. O ruru ihe dịka kilomita asatọ ma a na-aga nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke osimiri Jọdan, bụrụkwa ụzọ dị oke mkpa a ga-eji baa nʼala nkwa ahụ.
Ha gara nʼobodo ahụ baa nʼụlọ nwanyị akwụna aha ya bụ Rehab nọọ ọnọdụ nʼebe ahụ.

2Ma otu onye gwara eze Jeriko okwu sị, “Lee, ụfọdụ ụmụ ndị ikom Izrel batara obodo a nʼabalị inyochapụta ala anyị.” 3Mgbe eze Jeriko nụrụ okwu a, o zigaara Rehab ozi sị, “Kpọpụta ndị ikom ahụ batara nʼụlọ gị nʼihi na ha bịara iledo ala anyị.”

4Ma nwanyị ahụ zoro mmadụ abụọ ahụ. Mgbe ndị ahụ e ziri ozi bịarutere, ọ gwara ha okwu sị, “Ọ bụ eziokwu na ndị ikom ahụ bakwutere m, ma amaghị m ebe ha si bịa. 5Ma ha apụọlarị. Ha hapụrụ obodo a mgbe a na-achọ imechi ọnụ ụzọ ama, nʼoge ọchịchịrị bidoro ịgba. Amaghị m ebe ha gara. Ma, nʼuche m, ọ bụrụ na unu achụso ha ọsọ ọsịịsọ unu nwere ike ijide ha.” 6(Nʼeziokwu ọ bụ Rehab nʼonwe ya mere ka mmadụ abụọ ahụ rigoro nʼelu ụlọ ebe o zoro ha nʼokpuru ahịhịa flakisi ọ wụsara nʼebe ahụ.) 7Ya mere, ndị ikom ahụ pụrụ na-achụ ndị nnyopụta ahụ nʼakụkụ ụzọ gara ngabiga Jọdan. Ma ngwangwa ha pụrụ, e mechiri ọnụ ụzọ ama e si abata obodo ahụ.

8Ma tupu ndị nnyopụta ahụ edina ala ịrahụ ụra nʼabalị ahụ, Rehab rịgokwuru ha, 9gwa ha sị, “Ama m na Onyenwe anyị enyela unu ala a, b marakwa na oke ụjọ nke egwu unu adakwasịla anyị, nke mere na ndị niile bi nʼime ala a na-agbaze nʼegwu nʼihi unu, 10nʼihi na anyị anụla otu Onyenwe anyị si mee ka mmiri dị nʼOsimiri Uhie taa nʼihi unu, mgbe unu si nʼIjipt pụta. Anyị nụkwara ihe unu mere Saịhọn, na Ọg, bụ eze abụọ ndị Amọrị, ndị bi nʼọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan, otu unu si bibie ha, gbuchapụ ndị niile bi nʼala ahụ. 11Ma mgbe anyị nụrụ ihe ndị a, obi anyị gbazere nʼihi ụjọ, mmụọ onye ọbụla dara mba nʼihi unu, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa.

12“Ugbu a, ebe ọ bụ na m emeelara unu ebere, jirinụ Onyenwe anyị ṅụọrọ m iyi na unu ga-emere ezinaụlọ m ebere. Gosinụ m ihe ịrịbama nʼeziokwu, 13na unu ga-emekwa ka ndụ nna m, na nne m, na ụmụnne m ndị ikom na ndị inyom, na ndị ezinaụlọ ha niile dịrị, na unu ga-anapụta anyị site nʼọnwụ.”

14Ndị ikom ahụ kwere ya nkwa sị, “Ndụ anyị lara ndụ unu. Ọ bụrụ na ị gbaghị anyị ama, anyị ga-egosi gị obi ebere na ikwesi ntụkwasị obi mgbe Onyenwe anyị ga-enye anyị ala a.”

15Ụlọ Rehab dị nʼakụkụ mgbidi obodo ahụ. O ji ụdọ site na oghereikuku wedata ndị ikom abụọ ahụ. 16Ọ gwakwara ha sị, “Gbalaganụ nʼugwu, zoonụ onwe unu nʼebe ahụ ụbọchị atọ, tutu ndị ahụ na-achọ unu alaghachi azụ. Mgbe ahụ, unu nwere ike ịpụta laghachi ebe unu si bịa.”

17Ndị ahụ gwara ya sị, “Iyi a i mere ka anyị ṅụọ agaghị adị ire megide anyị, 18ma ọ bụrụ na nʼụbọchị ahụ anyị ga-abata ala a, i wereghị ụdọ ahụ na-acha uhie uhie kenye ya na oghereikuku i si wedata anyị, ma ọ bụrụkwa na ịkpọbataghị nʼụlọ gị nna gị, na nne gị, na ụmụnne gị ndị ikom, na ndị ezinaụlọ gị niile. 19Ọ bụrụ na onye ọbụla esite nʼụlọ gị pụọ nʼezi, ọbara ya agaghị adị anyị nʼisi, anyị agaghị abụkwa ndị ikpe mara. Ma ikpe ọmụma dịrị anyị ma ọ bụrụ nʼihe ọbụla emee onye ọbụla gị na ya so nọdụ nʼime ụlọ. 20Ma ọ bụrụ na ị gbaa anyị ama, ọ dịkwaghị iwu ji anyị imezu iyi a i mere ka anyị ṅụọrọ gị.”

21Rehab zara sị ha, “Dịka okwu niile unu kwuru si dị, otu a ka ọ ga-adị.”

O zilagara ha. Ha pụkwara gaara onwe ha. Ma Rehab kekwasịrị ụdọ uhie uhie ahụ nʼọnụ oghereikuku ụlọ ya.

22Ndị ikom abụọ ahụ gara zoo onwe ha nʼugwu ahụ. Ha nọrọ ụbọchị atọ nʼebe ahụ dịka Rehab gwara ha, tutu ndị ahụ na-achụ ha laghachiri nʼobodo Jeriko. Ndị a chọọrọ ha gaa ebe niile, nʼokporoụzọ niile, ma ha ahụghị ha. 23Emesịa, mmadụ abụọ ahụ e zipụrụ iledo ala ahụ anya sitere nʼebe ha zoro onwe ha rịpụta, gafee osimiri Jọdan, laghachi nʼebe ụmụ Izrel nọ. Ha bịara kọọrọ Joshua nwa Nun otu ha si gaa ije ha. 24Ha gwara Joshua sị, “Nʼezie, Onyenwe anyị enyela anyị ala ahụ niile, nʼihi na ndị niile bi nʼala ahụ na-atụ anyị ụjọ.”

Copyright information for IboBIU